Anwu na-enweghi ohere
Mimi Werna
Joe Werna

Anwụ ụtụtụ malitere site na east.

Anuru m ka ọkukọ kwara akwa n'ụtụtụ.

1

Anwụ gafere ngwuru Terfa tupu nri ụtụtụ.

Anuru m isi bier na akpupa nke soro anwu ekubata na ṅpio.

2

Anwụ gara na-azu ụlọ akwukwo n'oge nri ehihe.

Owee nọrọ na-etiti ama egwuregwu.

3

Anwụ kwụrụ n'elu isi m. Onyinyo m kwụrụ na-akuku m.

Mụ na ndi enyi m gwuru egwu onyinyo.

4

Onyinyo m biara buwanye, biakwa pee mpe. Anyi gbasobe ya.

Onyinyo m towara ogologo, biakwa di nkenke. Anyi gbasobe ya.

5

M kwụụrụ, ndi enyi m kwurụ. Anyi hụru onyinyo anyi ka ọ na-efeghari.

Ike gwụrụ anyi, anyi wee laghachi n'ime klasi. Ka akwụkwọ gbasara, anyi laghachi n'ụlọ.

6

Anwụ yere uyere.

Ahuru m anyanwụ ka o ji nwaayo nwaayo agbada n'odida. Ahuru m onyinyo m n'ahu aja.

Ǫ bụ oge eji ehi ụra.

7

Anyanwụ wee daa.

E dinara m n'akwa m, wee rọọ nrọ ebe anyanwụ gara njem di aṅya.

8
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Anwu na-enweghi ohere
Author - Mimi Werna
Translation - Chinwe Oranye, Merit Ibekeme, Ngozi Emuejeraye
Illustration - Joe Werna
Language - Igbo
Level - First paragraphs