Ugbọala bọsụ ojii ukwu
Mecelin Kakoro
Mango Tree

Enwere nanị otu ụgbọala bọsụ n'obodo nta ebe Ebere bi. Oburu ibu dịkwa ojii. Ọ na-eme mkpọtu ebe ọdi ukwuu.

1

Nne Ebere sịrị ya, "Echi, anyị ga-aga n'obodo mepere-emepe. Anyị ga-aga ịzụta uwe ụlọ akwụkwọ gị."

2

Obi tọrọ Ebere ụtọ nke ukwuu. Ha ga-aga njem nime ụgbọala bọsụ ojii ukwu ahụ. Ụra atụghị ya n'abalị ahụ.

3

Mgbe nne ya bịara ịkpọte ya, Ebere ejikerelarịị.

4

Ebere na nne ya wee jerue n'ọdụ ụgbọala bọsụ. Ha wee chere ụgbọala bọsụ ukwu ojii. Ma bọsụ abịaghị.

5

Ndị ọzọkwa wee bịarue n'ọdụ ụgbọala bọsụ. Ha wee na-eme mkpesa n'ihi na bọsụ abịaghị n'oge. Ha nọrọ na-ajṷrịta onwe ha sị, "Ebekwanṷ ka bọsṷ dị?"

6

Ọnọdu ahụ wutere Ebere. O wee chee n'obi ya sị, "Anyị agaghị enwekwa ike ịga obodo mepere-emepe. Agaghị m enwe ike iweta uwe ụlọ akwụkwọ m."

7

Obi dara ụfọdụ mmadụ mba, Ha wee laghachi n'ụlọ ha. Ebere wee bee akwa. Ọchọghị ịla. Nne ya wee sị ya, "Anyị ga-echetụ nwa obere oge."

8

N'otu-ntabi-anya, ha wee nụ mkpọtụ. Ha wee hụ uzuzu n'ikuku. Ọbụ ụgbọala n'abịa!

9

Ma ṷgbọala nkaa adịghị ojii. Ọdịghị ukwuu. Ọdị ntakịrị na-achakwa uhie-uhie. Ndị mmadụ achọghị ịbanye n'ime ụgbọala nkaa.

10

Ọkwọ ụgbọala ahụ wee tie sị, "Batanụ! Batanụ! Anyị bịara nnọ n'azụ oge taa!"

11

Ebere na nne ya buru ụzọ banye. Na mgbe n'adịghị anya, ndị ọzọ banyekwara n'ime ụgbọala uhie-uhie ahụ.

12

Ebere lepụrụ anya na windo, ọhụrụ ọtụtụ ndị ọzọkwa nọ n'ọdụ ụgbọala bọsụ.

13

Ọtụtụ ndị mmadụ ọzọ n'agbata ọsọ ịbanye n'ime ụgbọala. Ma ha abịaghị n'oge, ụgbọala uhie-uhie ejula. O wee gbara gawa obodo mepere-emepe.

14

Nne Ebere wee jụọ ajụjụ sị, "Oleekwanụ ụgbọala ojii ukwu?" Ọkwọ ụgbọala wee zaa si, "Omebiri emebi. Anyị na-edozi ya. O ga-abịa echi."

15

Ọgbasaghị Ebere ma ụgbọala ọ dị ọcha ma ọ dị ojii. Ọgbasaghị ya ma oburu- ibu ma ọdị ntakịrị. Ụgbọalaa na-aga obodo mepere-emepe!

16
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Ugbọala bọsụ ojii ukwu
Author - Mecelin Kakoro
Translation - Nwanne Felix-Emeribe
Illustration - Mango Tree
Language - Igbo
Level - First sentences